ỤDAOLU N'USORO OKWU IGBO: NDỊICHE SITERE N'OLU NANKA
Keywords:
udaolu, usoro okwu, olu NankaAbstract
Nchọcha a tulekọrịtara ụdaolu n'olu Nanka na Igbo Izugbe iji chọpụta ma
e nwere myiri na ndịiche dị n'etiti ha. A chịkọtara ahịrị okwu iri e jiri mee
nchọcha a site n'ọnụ ndị okenye sitere na Nanka ndị o nwebeghi mgbe ha
hapụrụ obodo Nanka gaa biri n'obodo ọzọ. A gbasoro atụtụ akụkụ nnọrọ
onwe wee tụchaa ahịrị okwu e jiri mee nchọcha. Nchọpụta gosiri na e
nwere myiri na ndịiche dị n'etiti olu Nanka na Igbo Izugbe. A chọpụtara
na e nwere ụdaolu atọ n'olumba Nanka dị ka ọ dị n'Igbo Izugbe, mana ụda
nsụda na-ewete ndịiche n'etiti mkpụrụokwu ụfọdụ n'olu Nanka. A
chọpụtakwazịrị na e nwere mkpọgo na mkpọda na-abata n'olu Nanka nke
na-adịghị n'Igbo Izugbe. Mkpọgo na mkpọda a nke na-apụta ihe na
asụrasụ olu Nanka na-eweta ndịiche pụrụ iche nke na-eme na a na-eji ya
amata mgbe onye Nanka sụrụ asụsu. Ebumnobi nchọcha a buikwalite
asụsụ Igbo nakwa ikpalite mmụo ndị mmadụ ka a gaa n’ihu n'ịtụle olu
mba dị iche iche e nwere n'asụsụ Igbo iji chọpụta ihe ndị ọzọ dị omimi
banyere ha nke na-anaghị apụta ihe n'Igbo Izug
Downloads
Published
Issue
Section
License
Copyright (c) 2026 Chinweude Nwakaego Ugochukwu (Author)

This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial 4.0 International License.